Ce document contient le Symbole de Nicée-Constantinople (325, 381) en langue igbo parlée au Nigeria, au Cameroun, en Guinée équatoriale et dans divers pays outre-mer.

1 pages.

Le Symbole de Nicée en langue igbo

Ekwem n’otù Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa, Na ihe nile anya nāhu, na nke anya nādigh-ahu:

Ekwem n’otù Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Ọkpara Chineke muru náni Ya, Onye Nna-Ya mutara tutu uwa nile adi, Chineke Nke putara na Chineke, Ìhè Nke putara n’Ìhè, Ezi Chineke Nke putara n’ezi Chineke, Onye amutara amuta, ma ekegh Ya ekè, Onye Ya na Nna bu otù udi; Onye esitere n’aka-Ya we kè ihe nile, Onye si n’elu-igwe ridata, n’ihi ayi, bú madu, na n’ihi nzọputa-ayi, Onye yiri anu-aru madu site na Mọ Nsọ nke aru Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, Ewe me Ya madu, Akpọgide kwa Ya n’obe n’ihi ayi n’ubọchi Pọntiọs Pailet. Ọ hu ahuhu, elìe Ya, N’ubọchi nke-atọ O siri n’ọnwu bilite ọzọ dika Akwukwọ Nsọ si kwu, Ọ rigoro n’elu-igwe, Ọ nānọdu n’aka-nri Chineke, bú Nna. Ọ gābia kwa ọzọ n’otuto ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu: Onye ala-eze-Ya nāgagh-enwe ọgwugwu.

Ekwekwam na Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayí, na Onye nēnye ndu, Onye si na Nna na Ọkpara puta, Onye anēkpere nēto kwa Ya na Nna na Ọkpara n’ọbọ, Onye kwuru okwu site n’ọnu Ndi-arnuma, Ekwekwam otù Nzukọ Katolik nke nēso Ndi-ozi. Ekwem otù Baptism n’ihi nbaghara nmehie. Anamele kwa anya Nbilite-n’onwu nke ndi nwuru anwu, Na ndu nke uwa gābia abia. Amen.